Habakuk 1:9
Habakkuk 1:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha niile na-abịa ime ihe ike. Ha ji ọsọ na-abịa dịka oke ifufe nke ọzara. Ha na-abịa ịchịkọta ndị a dọtara nʼagha dịka ha bụ uzuzu.
Habakkuk 1:9 in English
Habakkuk 1:9 · Berean Standard Bible
All of them come bent on violence; their hordes advance like the east wind; they gather prisoners like sand.
Context
7Ha bụ mba a na-atụ ụjọ, na ndị dịkwa egwu.
Ha bụ iwu nye onwe ha, ihe ha tụpụtara ka ha na-eme.
Ọ bụ onwe ha ka ha na-ebuli elu. 8Ịnyịnya ha nwere ụkwụ nkọ karịa agụ.
Ha na-akpa ike karịa nkịta ọhịa nke na-ejegharị nʼanyasị.
Ndị ịnyịnya agha ha na-awụ ọsọ,
ndị ha na-agba ịnyịnya na-esitekwa ebe dị anya na-abịa.
Dịka ugo nke na-efedata i buru nri ọ ga-eri. 9Ha niile na-abịa ime ihe ike.
Ha ji ọsọ na-abịa dịka oke ifufe nke ọzara.
Ha na-abịa ịchịkọta ndị a dọtara nʼagha dịka ha bụ uzuzu. 10Ha na-akwa ndị eze emo,
jirikwa ndịisi ọchịchị na-eme ihe ọchị.
Ha na-achị ebe niile e wusiri ike ọchị,
na-ekpokọtakwa aja nʼazụ mgbidi niile ịlụta ha nʼagha. 11Mgbe ahụ, ha na-esi nʼebe ahụ gabiga dịka ifufe, na-agabigakwa
ndị mehierenụ, bụrụkwa ndị ikpe mara, ndị ike ha bụ chi ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.