Habakuk 1:16
Habakkuk 1:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nke a, ọ na-achụ aja na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ụgbụ ya, nʼihi na ọ bụ ụgbụ ya na-eme ka ọ na-ebi ezi ndụ, na-erikwa nri kachasị mma
Habakkuk 1:16 in English
Habakkuk 1:16 · Berean Standard Bible
Therefore he sacrifices to his dragnet and burns incense to his fishing net, for by these things his portion is sumptuous and his food is rich.
Context
14I meela ndị mmadụ ka ha dịrị ka azụ nke osimiri,
e, dịka anụ na-akpụ akpụ nke oke osimiri, nke na-enweghị onye na-achị ha. 15Onye iro nke ajọ omume juru obi, na-eji nko ya na-egbu ha.
Ọ na-ejikwa nko ụgbụ ya na-ejide ha.
Ọ na-achịkọta ha nʼụgbụ ya,
si otu a na-aṅụrị ọṅụ, ma na-etegharịkwa egwu ọṅụ. 16Nʼihi nke a, ọ na-achụ aja
na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ụgbụ ya,
nʼihi na ọ bụ ụgbụ ya na-eme ka ọ na-ebi ezi ndụ,
na-erikwa nri kachasị mma 17Ọ ga-aga nʼihu mgbe niile na-awụpụ ihe o ji ụgbụ ya gbute
na-ala mba niile nʼiyi, dịka o si masị ya, na-egosighị obi ebere ọbụla?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.