Habakuk 1:17
Habakkuk 1:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-aga nʼihu mgbe niile na-awụpụ ihe o ji ụgbụ ya gbute na-ala mba niile nʼiyi, dịka o si masị ya, na-egosighị obi ebere ọbụla?
Habakkuk 1:17 in English
Habakkuk 1:17 · Berean Standard Bible
Will he, therefore, empty his net and continue to slay nations without mercy?
Context
15Onye iro nke ajọ omume juru obi, na-eji nko ya na-egbu ha.
Ọ na-ejikwa nko ụgbụ ya na-ejide ha.
Ọ na-achịkọta ha nʼụgbụ ya,
si otu a na-aṅụrị ọṅụ, ma na-etegharịkwa egwu ọṅụ. 16Nʼihi nke a, ọ na-achụ aja
na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ụgbụ ya,
nʼihi na ọ bụ ụgbụ ya na-eme ka ọ na-ebi ezi ndụ,
na-erikwa nri kachasị mma 17Ọ ga-aga nʼihu mgbe niile na-awụpụ ihe o ji ụgbụ ya gbute
na-ala mba niile nʼiyi, dịka o si masị ya, na-egosighị obi ebere ọbụla?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.