Jenesis 48:20
Genesis 48:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ gọziri ha nʼụbọchị ahụ sị, “Nʼaha gị ka Izrel ga-ekwupụta ngọzị a, ‘Ka Chineke mee gị dịka Ifrem na Manase.’ ” Ya mere o buru ụzọ kpọọ Ifrem tupu Manase.
Genesis 48:20 in English
Genesis 48:20 · Berean Standard Bible
So that day Jacob blessed them and said: “By you shall Israel pronounce this blessing: ‘May God make you like Ephraim and Manasseh.’” So he put Ephraim before Manasseh.
Context
18Mgbe ahụ, Josef sịrị nna ya, “I bikwasịjọrọ aka gị. Onye a bụ ọkpara, bikwasị aka nri gị nʼisi ya.” 19Ma nna ya jụrụ, sị ya, “Amaara m ihe m na-eme nwa m, Manase ga-aghọ oke obodo, ma nwanne ya nke nta ga-akarị ya ịdị ukwuu, nʼihi na ụmụ ụmụ ya ga-aghọ ọtụtụ mba dị iche iche.” 20Ọ gọziri ha nʼụbọchị ahụ sị,
“Nʼaha gị ka Izrel ga-ekwupụta ngọzị a,
‘Ka Chineke mee gị dịka Ifrem na Manase.’ ”
Ya mere o buru ụzọ kpọọ Ifrem tupu Manase. 21Mgbe ahụ, Izrel gwara Josef okwu sị ya, “Lee, mụ onwe m na-aga ịnwụ. Ma Chineke ga-anọnyere unu, kpọghachikwa unu azụ nʼala nna unu ha. 22Mụ onwe m na-enye gị otu akụkụ ugwu karịa nke ụmụnne gị, bụ ala ugwu ahụ m sitere na mma agha m na ụta m napụta ndị Amọrait ka ọ bụrụ nke gị.”
48:12 Ị kuu mmadụ nʼikpere, bụ mmemme iji gosipụta na onye ahụ eku nʼikpere, a bụrụla nwa onye ahụ kuu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.