Jenesis 48:19
Genesis 48:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma nna ya jụrụ, sị ya, “Amaara m ihe m na-eme nwa m, Manase ga-aghọ oke obodo, ma nwanne ya nke nta ga-akarị ya ịdị ukwuu, nʼihi na ụmụ ụmụ ya ga-aghọ ọtụtụ mba dị iche iche.”
Genesis 48:19 in English
Genesis 48:19 · Berean Standard Bible
But his father refused. “I know, my son, I know!” he said. “He too shall become a people, and he too shall be great; nevertheless, his younger brother shall be greater than he, and his offspring shall become a multitude of nations.”
Context
17O wutere Josef mgbe ọ hụrụ na nna ya bikwasịrị aka nri ya nʼisi Ifrem. O jidere aka nna ya iwepụ ya nʼisi Ifrem, ka ọ tụkwasị ya nʼisi Manase. 18Mgbe ahụ, Josef sịrị nna ya, “I bikwasịjọrọ aka gị. Onye a bụ ọkpara, bikwasị aka nri gị nʼisi ya.” 19Ma nna ya jụrụ, sị ya, “Amaara m ihe m na-eme nwa m, Manase ga-aghọ oke obodo, ma nwanne ya nke nta ga-akarị ya ịdị ukwuu, nʼihi na ụmụ ụmụ ya ga-aghọ ọtụtụ mba dị iche iche.” 20Ọ gọziri ha nʼụbọchị ahụ sị,
“Nʼaha gị ka Izrel ga-ekwupụta ngọzị a,
‘Ka Chineke mee gị dịka Ifrem na Manase.’ ”
Ya mere o buru ụzọ kpọọ Ifrem tupu Manase. 21Mgbe ahụ, Izrel gwara Josef okwu sị ya, “Lee, mụ onwe m na-aga ịnwụ. Ma Chineke ga-anọnyere unu, kpọghachikwa unu azụ nʼala nna unu ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.