Native Bible

Genesis 48:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Izrel gwara Josef okwu sị ya, “Lee, mụ onwe m na-aga ịnwụ. Ma Chineke ga-anọnyere unu, kpọghachikwa unu azụ nʼala nna unu ha.

Genesis 48:21 in English

Genesis 48:21 · Berean Standard Bible

Then Israel said to Joseph, “Look, I am about to die, but God will be with you and bring you back to the land of your fathers.

Context

19Ma nna ya jụrụ, sị ya, “Amaara m ihe m na-eme nwa m, Manase ga-aghọ oke obodo, ma nwanne ya nke nta ga-akarị ya ịdị ukwuu, nʼihi na ụmụ ụmụ ya ga-aghọ ọtụtụ mba dị iche iche.” 20Ọ gọziri ha nʼụbọchị ahụ sị, “Nʼaha gị ka Izrel ga-ekwupụta ngọzị a, ‘Ka Chineke mee gị dịka Ifrem na Manase.’ ” Ya mere o buru ụzọ kpọọ Ifrem tupu Manase. 21Mgbe ahụ, Izrel gwara Josef okwu sị ya, “Lee, mụ onwe m na-aga ịnwụ. Ma Chineke ga-anọnyere unu, kpọghachikwa unu azụ nʼala nna unu ha. 22Mụ onwe m na-enye gị otu akụkụ ugwu karịa nke ụmụnne gị, bụ ala ugwu ahụ m sitere na mma agha m na ụta m napụta ndị Amọrait ka ọ bụrụ nke gị.” 48:12 Ị kuu mmadụ nʼikpere, bụ mmemme iji gosipụta na onye ahụ eku nʼikpere, a bụrụla nwa onye ahụ kuu ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.