Jenesis 48:17
Genesis 48:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O wutere Josef mgbe ọ hụrụ na nna ya bikwasịrị aka nri ya nʼisi Ifrem. O jidere aka nna ya iwepụ ya nʼisi Ifrem, ka ọ tụkwasị ya nʼisi Manase.
Genesis 48:17 in English
Genesis 48:17 · Berean Standard Bible
When Joseph saw that his father had placed his right hand on Ephraim’s head, he was displeased and took his father’s hand to move it from Ephraim’s head to Manasseh’s.
Context
15Mgbe ahụ, ọ gọziri Josef sị ya.
“Ka Chineke, onye nna m ha
Ebraham na Aịzik jere ije nʼihu ya
Chineke onye bụrịị Onye zụrụ m dịka atụrụ
ogologo ndụ m niile ruo taa, 16Mmụọ ozi ahụ napụtara m site nʼihe egwu niile,
ya gọzie ụmụ ndị ikom ndị a.
Ka ha bụrụ ndị a kpọkwasịrị aha m
na aha nna m ha Ebraham na Aịzik,
ka ha mụbaa
hie nne nʼelu ụwa.” 17O wutere Josef mgbe ọ hụrụ na nna ya bikwasịrị aka nri ya nʼisi Ifrem. O jidere aka nna ya iwepụ ya nʼisi Ifrem, ka ọ tụkwasị ya nʼisi Manase. 18Mgbe ahụ, Josef sịrị nna ya, “I bikwasịjọrọ aka gị. Onye a bụ ọkpara, bikwasị aka nri gị nʼisi ya.” 19Ma nna ya jụrụ, sị ya, “Amaara m ihe m na-eme nwa m, Manase ga-aghọ oke obodo, ma nwanne ya nke nta ga-akarị ya ịdị ukwuu, nʼihi na ụmụ ụmụ ya ga-aghọ ọtụtụ mba dị iche iche.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.