Jenesis 48:15
Genesis 48:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ọ gọziri Josef sị ya. “Ka Chineke, onye nna m ha Ebraham na Aịzik jere ije nʼihu ya Chineke onye bụrịị Onye zụrụ m dịka atụrụ ogologo ndụ m niile ruo taa,
Genesis 48:15 in English
Genesis 48:15 · Berean Standard Bible
Then he blessed Joseph and said: “May the God before whom my fathers Abraham and Isaac walked, the God who has been my shepherd all my life to this day,
Context
13Josef kpọọrọ ha abụọ, Ifrem nʼaka nri ya nke bụ aka ekpe Izrel, na Manase nʼaka ekpe ya nke bụ aka nri Izrel, kpọta ha bịa nna ya nso. 14Ma Izrel setịrị aka nri bikwasị ya nʼisi Ifrem, nwa nke nta. Ma aka ekpe ya ka o setịpụrụ bikwasị nʼisi Manase bụ ọkpara. 15Mgbe ahụ, ọ gọziri Josef sị ya.
“Ka Chineke, onye nna m ha
Ebraham na Aịzik jere ije nʼihu ya
Chineke onye bụrịị Onye zụrụ m dịka atụrụ
ogologo ndụ m niile ruo taa, 16Mmụọ ozi ahụ napụtara m site nʼihe egwu niile,
ya gọzie ụmụ ndị ikom ndị a.
Ka ha bụrụ ndị a kpọkwasịrị aha m
na aha nna m ha Ebraham na Aịzik,
ka ha mụbaa
hie nne nʼelu ụwa.” 17O wutere Josef mgbe ọ hụrụ na nna ya bikwasịrị aka nri ya nʼisi Ifrem. O jidere aka nna ya iwepụ ya nʼisi Ifrem, ka ọ tụkwasị ya nʼisi Manase.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.