Jenesis 48:14
Genesis 48:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Izrel setịrị aka nri bikwasị ya nʼisi Ifrem, nwa nke nta. Ma aka ekpe ya ka o setịpụrụ bikwasị nʼisi Manase bụ ọkpara.
Genesis 48:14 in English
Genesis 48:14 · Berean Standard Bible
But Israel stretched out his right hand and put it on the head of Ephraim, the younger; and crossing his hands, he put his left on Manasseh’s head, although Manasseh was the firstborn.
Context
12Josef sitere nʼikpere* Jekọb kupu ụmụ ya, bịa hulata isi ala. O kpuru ihu ya nʼala mgbe o mere nke a. 13Josef kpọọrọ ha abụọ, Ifrem nʼaka nri ya nke bụ aka ekpe Izrel, na Manase nʼaka ekpe ya nke bụ aka nri Izrel, kpọta ha bịa nna ya nso. 14Ma Izrel setịrị aka nri bikwasị ya nʼisi Ifrem, nwa nke nta. Ma aka ekpe ya ka o setịpụrụ bikwasị nʼisi Manase bụ ọkpara. 15Mgbe ahụ, ọ gọziri Josef sị ya.
“Ka Chineke, onye nna m ha
Ebraham na Aịzik jere ije nʼihu ya
Chineke onye bụrịị Onye zụrụ m dịka atụrụ
ogologo ndụ m niile ruo taa, 16Mmụọ ozi ahụ napụtara m site nʼihe egwu niile,
ya gọzie ụmụ ndị ikom ndị a.
Ka ha bụrụ ndị a kpọkwasịrị aha m
na aha nna m ha Ebraham na Aịzik,
ka ha mụbaa
hie nne nʼelu ụwa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.