Native Bible

Genesis 36:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ada mụụrụ Ịsọ Elifaz, ebe Basemat mụrụ Reuel.

Genesis 36:4 in English

Genesis 36:4 · Berean Standard Bible

And Adah bore Eliphaz to Esau, Basemath gave birth to Reuel,

Context

2Ịsọ lụrụ ndị inyom a site nʼala Kenan. Onye nke mbụ bụ Ada nwa Elọn, onye Het. Nke abụọ bụ Oholibama, nwa Ana, nwa nwa Zibiọn, onye Hiv. 3Onye nke atọ bụ Basemat, nwa Ishmel, onye nwanne ya nwanyị bụ Nebaiot. 4Ada mụụrụ Ịsọ Elifaz, ebe Basemat mụrụ Reuel. 5Oholibama mụtaara Jeush na Jalam na Kora. Ndị a bụ ụmụ Ịsọ ndị a mụtara ya nʼala Kenan. 6Emesịa, Ịsọ duuru ndị nwunye ya na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom, na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya. Ọ chịkọọrọ anụ ụlọ ya niile, na akụ niile ọ kpatara nʼala Kenan kwapụ gaa biri nʼala dị anya site nʼebe nwanne ya Jekọb nọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.