Native Bible

Genesis 36:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Oholibama mụtaara Jeush na Jalam na Kora. Ndị a bụ ụmụ Ịsọ ndị a mụtara ya nʼala Kenan.

Genesis 36:5 in English

Genesis 36:5 · Berean Standard Bible

and Oholibamah gave birth to Jeush, Jalam, and Korah. These were the sons of Esau, who were born to him in the land of Canaan.

Context

3Onye nke atọ bụ Basemat, nwa Ishmel, onye nwanne ya nwanyị bụ Nebaiot. 4Ada mụụrụ Ịsọ Elifaz, ebe Basemat mụrụ Reuel. 5Oholibama mụtaara Jeush na Jalam na Kora. Ndị a bụ ụmụ Ịsọ ndị a mụtara ya nʼala Kenan. 6Emesịa, Ịsọ duuru ndị nwunye ya na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom, na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya. Ọ chịkọọrọ anụ ụlọ ya niile, na akụ niile ọ kpatara nʼala Kenan kwapụ gaa biri nʼala dị anya site nʼebe nwanne ya Jekọb nọ. 7Ebe ọ bụ na akụnụba ha nwere dịkarịrị ukwuu ha ibikọta ọnụ, tinyekwara na ala ebe ha bi enwezighị ike ibuli ha nʼihi anụ ụlọ niile ha nwere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.