Jenesis 36:6
Genesis 36:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, Ịsọ duuru ndị nwunye ya na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom, na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya. Ọ chịkọọrọ anụ ụlọ ya niile, na akụ niile ọ kpatara nʼala Kenan kwapụ gaa biri nʼala dị anya site nʼebe nwanne ya Jekọb nọ.
Genesis 36:6 in English
Genesis 36:6 · Berean Standard Bible
Later, Esau took his wives and sons and daughters and all the people of his household, along with his livestock, all his other animals, and all the property he had acquired in Canaan, and he moved to a land far away from his brother Jacob.
Context
4Ada mụụrụ Ịsọ Elifaz, ebe Basemat mụrụ Reuel. 5Oholibama mụtaara Jeush na Jalam na Kora. Ndị a bụ ụmụ Ịsọ ndị a mụtara ya nʼala Kenan. 6Emesịa, Ịsọ duuru ndị nwunye ya na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom, na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya. Ọ chịkọọrọ anụ ụlọ ya niile, na akụ niile ọ kpatara nʼala Kenan kwapụ gaa biri nʼala dị anya site nʼebe nwanne ya Jekọb nọ. 7Ebe ọ bụ na akụnụba ha nwere dịkarịrị ukwuu ha ibikọta ọnụ, tinyekwara na ala ebe ha bi enwezighị ike ibuli ha nʼihi anụ ụlọ niile ha nwere. 8Ya mere, Ịsọ gara biri nʼala ugwu ugwu Sia, Ịsọ bụkwa Edọm.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.