Jenesis 2:24
Genesis 2:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.
Genesis 2:24 in English
Genesis 2:24 · Berean Standard Bible
For this reason a man will leave his father and mother and be united to his wife, and they will become one flesh.*
Context
22Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke ji otu ọgịrịga o si nʼahụ nwoke ahụ wepụta, mee nwanyị, dutere ya nwoke ahụ. 23Nwoke ahụ kwuru sị,
“Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m,
na anụ ahụ si nʼahụ m,
a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’
nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya.” 24Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ. 25Nwoke ahụ na nwunye ya gba ọtọ, ma ihere emeghị ha.
2:13 Kush bụ aha e ji maara ala ndị Sụdan maọbụ Itiopia nʼasụsụ ndị Hibru. Mgbe ọbụla e kwuru banyere Kush nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ ochie, ọ bụ ala ahụ ka a na-ekwu ihe banyere ya.
2:14 Ashọ na Asịrịa bụ otu ihe
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.