Jenesis 2:22
Genesis 2:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke ji otu ọgịrịga o si nʼahụ nwoke ahụ wepụta, mee nwanyị, dutere ya nwoke ahụ.
Genesis 2:22 in English
Genesis 2:22 · Berean Standard Bible
And from the rib that the LORD God had taken from the man, He made a woman and brought her to him.
Context
20Ya mere, mmadụ ahụ nyere anụ ụlọ niile na anụ ufe niile na anụ ọhịa niile aha.
Ma nʼebe Adam nọ, o nweghị onye inyeaka kwesiri ya. 21Ya mere, Onyenwe anyị Chineke mere ka nwoke ahụ daa nʼụra. Mgbe ọ nọ na-arahụ ụra, o wepụtara otu ọgịrịga site na ngụ dị ya nʼahụ, mechikwaa ebe o si wepụta ya. 22Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke ji otu ọgịrịga o si nʼahụ nwoke ahụ wepụta, mee nwanyị, dutere ya nwoke ahụ. 23Nwoke ahụ kwuru sị,
“Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m,
na anụ ahụ si nʼahụ m,
a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’
nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya.” 24Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.