Native Bible

Genesis 2:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nwoke ahụ kwuru sị, “Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m, na anụ ahụ si nʼahụ m, a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’ nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya.”

Genesis 2:23 in English

Genesis 2:23 · Berean Standard Bible

And the man said: “This is now bone of my bones and flesh of my flesh; she shall be called ‘woman,’ for out of man she was taken.”

Context

21Ya mere, Onyenwe anyị Chineke mere ka nwoke ahụ daa nʼụra. Mgbe ọ nọ na-arahụ ụra, o wepụtara otu ọgịrịga site na ngụ dị ya nʼahụ, mechikwaa ebe o si wepụta ya. 22Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke ji otu ọgịrịga o si nʼahụ nwoke ahụ wepụta, mee nwanyị, dutere ya nwoke ahụ. 23Nwoke ahụ kwuru sị, “Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m, na anụ ahụ si nʼahụ m, a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’ nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya.” 24Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ. 25Nwoke ahụ na nwunye ya gba ọtọ, ma ihere emeghị ha. 2:13 Kush bụ aha e ji maara ala ndị Sụdan maọbụ Itiopia nʼasụsụ ndị Hibru. Mgbe ọbụla e kwuru banyere Kush nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ ochie, ọ bụ ala ahụ ka a na-ekwu ihe banyere ya. 2:14 Ashọ na Asịrịa bụ otu ihe

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.