Jenesis 11:30
Genesis 11:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Serai bụ nwanyị aga, ọ mụtaghị nwa ọbụla.
Genesis 11:30 in English
Genesis 11:30 · Berean Standard Bible
But Sarai was barren; she had no children.
Context
28Haran nwụrụ nʼihu nna ya Tera nʼala ebe a nọ mụọ ya, nke bụ na Ụọ, obodo ndị Kaldịa. 29Ebram na Nahọ lụrụ nwunye. Aha nwunye Ebram bụ Serai ma aha nwunye Nahọ bụ Milka. Milka bụ nwa Haran, onye bụ nna Milka na Iska. 30Ma Serai bụ nwanyị aga, ọ mụtaghị nwa ọbụla. 31Tera kpọrọ nwa ya Ebram, na nwa nwa ya Lọt, onye bụ nwa Haran,* na nwunye nwa ya Serai, bụ nwunye Ebram, duru ha hapụ Ụọ, obodo ndị Kaldịa, pụọ gawa nʼala Kenan. Ma mgbe ha bịarutere nʼobodo Haran, ha kwụsịrị biri nʼebe ahụ. 32Ọ bụ nʼobodo Haran ka Tera nọ nwụọ, mgbe ọ gbara narị afọ abụọ na ise.
11:3 Maọbụ, Aja ụrọ
11:9 Babel ya bụ Babilọn pụtara ọgbaaghara nʼasụsụ Hibru.
11:31 Haran bụ aha mmadụ, bụrụkwa aha obodo dị nʼala Mesopotamịa. Obodo e ji ife ọnwa mara, dị ka a makwaara obodo Ụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.