Native Bible

Genesis 11:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Tera kpọrọ nwa ya Ebram, na nwa nwa ya Lọt, onye bụ nwa Haran,* na nwunye nwa ya Serai, bụ nwunye Ebram, duru ha hapụ Ụọ, obodo ndị Kaldịa, pụọ gawa nʼala Kenan. Ma mgbe ha bịarutere nʼobodo Haran, ha kwụsịrị biri nʼebe ahụ.

Genesis 11:31 in English

Genesis 11:31 · Berean Standard Bible

And Terah took his son Abram, his grandson Lot son of Haran, and his daughter-in-law Sarai the wife of Abram, and they set out from Ur of the Chaldeans for the land of Canaan. But when they arrived in Haran, they settled there.

Context

29Ebram na Nahọ lụrụ nwunye. Aha nwunye Ebram bụ Serai ma aha nwunye Nahọ bụ Milka. Milka bụ nwa Haran, onye bụ nna Milka na Iska. 30Ma Serai bụ nwanyị aga, ọ mụtaghị nwa ọbụla. 31Tera kpọrọ nwa ya Ebram, na nwa nwa ya Lọt, onye bụ nwa Haran,* na nwunye nwa ya Serai, bụ nwunye Ebram, duru ha hapụ Ụọ, obodo ndị Kaldịa, pụọ gawa nʼala Kenan. Ma mgbe ha bịarutere nʼobodo Haran, ha kwụsịrị biri nʼebe ahụ. 32Ọ bụ nʼobodo Haran ka Tera nọ nwụọ, mgbe ọ gbara narị afọ abụọ na ise. 11:3 Maọbụ, Aja ụrọ 11:9 Babel ya bụ Babilọn pụtara ọgbaaghara nʼasụsụ Hibru. 11:31 Haran bụ aha mmadụ, bụrụkwa aha obodo dị nʼala Mesopotamịa. Obodo e ji ife ọnwa mara, dị ka a makwaara obodo Ụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.