Jenesis 11:29
Genesis 11:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebram na Nahọ lụrụ nwunye. Aha nwunye Ebram bụ Serai ma aha nwunye Nahọ bụ Milka. Milka bụ nwa Haran, onye bụ nna Milka na Iska.
Genesis 11:29 in English
Genesis 11:29 · Berean Standard Bible
And Abram and Nahor took wives for themselves. Abram’s wife was named Sarai, and Nahor’s wife was named Milcah; she was the daughter of Haran, who was the father of both Milcah and Iscah.
Context
27Nke a bụ akụkọ gbasara usoro ezinaụlọ Tera.
Tera ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran. Haran ghọrọ nna Lọt. 28Haran nwụrụ nʼihu nna ya Tera nʼala ebe a nọ mụọ ya, nke bụ na Ụọ, obodo ndị Kaldịa. 29Ebram na Nahọ lụrụ nwunye. Aha nwunye Ebram bụ Serai ma aha nwunye Nahọ bụ Milka. Milka bụ nwa Haran, onye bụ nna Milka na Iska. 30Ma Serai bụ nwanyị aga, ọ mụtaghị nwa ọbụla. 31Tera kpọrọ nwa ya Ebram, na nwa nwa ya Lọt, onye bụ nwa Haran,* na nwunye nwa ya Serai, bụ nwunye Ebram, duru ha hapụ Ụọ, obodo ndị Kaldịa, pụọ gawa nʼala Kenan. Ma mgbe ha bịarutere nʼobodo Haran, ha kwụsịrị biri nʼebe ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.