Jenesis 11:27
Genesis 11:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ akụkọ gbasara usoro ezinaụlọ Tera. Tera ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran. Haran ghọrọ nna Lọt.
Genesis 11:27 in English
Genesis 11:27 · Berean Standard Bible
This is the account of Terah. Terah became the father of Abram, Nahor, and Haran. And Haran became the father of Lot.
Context
25Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Tera, ọ dịrị ndụ narị afọ na afọ iri na itoolu ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 26Mgbe Tera gbara iri afọ asaa, ọ ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran. 27Nke a bụ akụkọ gbasara usoro ezinaụlọ Tera.
Tera ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran. Haran ghọrọ nna Lọt. 28Haran nwụrụ nʼihu nna ya Tera nʼala ebe a nọ mụọ ya, nke bụ na Ụọ, obodo ndị Kaldịa. 29Ebram na Nahọ lụrụ nwunye. Aha nwunye Ebram bụ Serai ma aha nwunye Nahọ bụ Milka. Milka bụ nwa Haran, onye bụ nna Milka na Iska.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.