Native Bible

Ezekiel 40:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ tụrụ ogologo ogidi niile dị nʼakụkụ nʼime mgbidi ọnụ ụzọ ama ụlọ ahụ, chọpụta na ọ dị iri mita atọ na abụọ, ọ bụladị ruo nʼakụkụ mgbidi nke chere ihu nʼọnụ ụzọ ama ogige ahụ.

Ezekiel 40:14 in English

Ezekiel 40:14 · Berean Standard Bible

Next he measured the gateposts to be sixty cubits high.* The gateway extended around to the gatepost of the courtyard.

Context

12Nʼihu oghere niile nke ụlọ ahụ e nwere mgbidi dị otu ọkara mita nʼịdị elu ya. Akụkụ anọ nke oghere ndị a ha otu. Ha ruru mita atọ mita atọ. 13Mgbe ahụ, ọ tụrụ obosara ọnụ ụzọ ama ahụ, site nʼelu ụlọ nke otu ime ụlọ ruo nʼelu ụlọ nke ime ụlọ chere ya ihu; obosara ya dị mita iri na atọ, site nʼotu oghere ruo nʼoghere nke chere ya ihu. 14Ọ tụrụ ogologo ogidi niile dị nʼakụkụ nʼime mgbidi ọnụ ụzọ ama ụlọ ahụ, chọpụta na ọ dị iri mita atọ na abụọ, ọ bụladị ruo nʼakụkụ mgbidi nke chere ihu nʼọnụ ụzọ ama ogige ahụ. 15Site nʼihu ọnụ ụzọ ama mbata ahụ, ruo nʼebe ngwụcha nke ọnụ ụzọ dị na mpụta ọnụ ụlọ ya dị iri mita abụọ na asaa. 16Ọnụ ụlọ ndị ahụ niile nwere oghereikuku dị warawara nʼakụkụ aja ụlọ ha, dịka mpụta ọnụ ụlọ ahụ nwekwara; oghereikuku ndị a dị gburugburu dị nʼime, nʼetiti ọnụ ụlọ ndị a. Nʼaja ụlọ ndị a niile, e nwere oyiyi nkwụ dị iche iche e sere nʼelu ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.