Izikiel 40:15
Ezekiel 40:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Site nʼihu ọnụ ụzọ ama mbata ahụ, ruo nʼebe ngwụcha nke ọnụ ụzọ dị na mpụta ọnụ ụlọ ya dị iri mita abụọ na asaa.
Ezekiel 40:15 in English
Ezekiel 40:15 · Berean Standard Bible
And the distance from the entrance of the gateway to the far end of its inner portico was fifty cubits.*
Context
13Mgbe ahụ, ọ tụrụ obosara ọnụ ụzọ ama ahụ, site nʼelu ụlọ nke otu ime ụlọ ruo nʼelu ụlọ nke ime ụlọ chere ya ihu; obosara ya dị mita iri na atọ, site nʼotu oghere ruo nʼoghere nke chere ya ihu. 14Ọ tụrụ ogologo ogidi niile dị nʼakụkụ nʼime mgbidi ọnụ ụzọ ama ụlọ ahụ, chọpụta na ọ dị iri mita atọ na abụọ, ọ bụladị ruo nʼakụkụ mgbidi nke chere ihu nʼọnụ ụzọ ama ogige ahụ. 15Site nʼihu ọnụ ụzọ ama mbata ahụ, ruo nʼebe ngwụcha nke ọnụ ụzọ dị na mpụta ọnụ ụlọ ya dị iri mita abụọ na asaa. 16Ọnụ ụlọ ndị ahụ niile nwere oghereikuku dị warawara nʼakụkụ aja ụlọ ha, dịka mpụta ọnụ ụlọ ahụ nwekwara; oghereikuku ndị a dị gburugburu dị nʼime, nʼetiti ọnụ ụlọ ndị a. Nʼaja ụlọ ndị a niile, e nwere oyiyi nkwụ dị iche iche e sere nʼelu ha. 17Ọ kpọbatara m nʼogige dị nʼezi. Nʼebe ahụ, ahụrụ m ụfọdụ ọnụụlọ dị na pevumentị e wunyere gburugburu ogige ahụ niile. Ha dị iri ọnụụlọ atọ dị nʼogologo pevumentị ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.