Native Bible

Ezekiel 40:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ọ tụrụ obosara ọnụ ụzọ ama ahụ, site nʼelu ụlọ nke otu ime ụlọ ruo nʼelu ụlọ nke ime ụlọ chere ya ihu; obosara ya dị mita iri na atọ, site nʼotu oghere ruo nʼoghere nke chere ya ihu.

Ezekiel 40:13 in English

Ezekiel 40:13 · Berean Standard Bible

Then he measured the gateway from the roof of one gate chamber to the roof of the opposite one; the distance was twenty-five cubits * from doorway to doorway.

Context

11Mgbe ahụ, ọ tụrụ obosara nke mbata ọnụ ụzọ ama ahụ, ọ dị mita ise na ụma atọ nʼobosara, na mita isii na ụma itoolu nʼogologo. 12Nʼihu oghere niile nke ụlọ ahụ e nwere mgbidi dị otu ọkara mita nʼịdị elu ya. Akụkụ anọ nke oghere ndị a ha otu. Ha ruru mita atọ mita atọ. 13Mgbe ahụ, ọ tụrụ obosara ọnụ ụzọ ama ahụ, site nʼelu ụlọ nke otu ime ụlọ ruo nʼelu ụlọ nke ime ụlọ chere ya ihu; obosara ya dị mita iri na atọ, site nʼotu oghere ruo nʼoghere nke chere ya ihu. 14Ọ tụrụ ogologo ogidi niile dị nʼakụkụ nʼime mgbidi ọnụ ụzọ ama ụlọ ahụ, chọpụta na ọ dị iri mita atọ na abụọ, ọ bụladị ruo nʼakụkụ mgbidi nke chere ihu nʼọnụ ụzọ ama ogige ahụ. 15Site nʼihu ọnụ ụzọ ama mbata ahụ, ruo nʼebe ngwụcha nke ọnụ ụzọ dị na mpụta ọnụ ụlọ ya dị iri mita abụọ na asaa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.