Izikiel 40:12
Ezekiel 40:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihu oghere niile nke ụlọ ahụ e nwere mgbidi dị otu ọkara mita nʼịdị elu ya. Akụkụ anọ nke oghere ndị a ha otu. Ha ruru mita atọ mita atọ.
Ezekiel 40:12 in English
Ezekiel 40:12 · Berean Standard Bible
In front of each gate chamber was a wall one cubit high, and the gate chambers were six cubits square.
Context
10Nʼime ọnụ ụzọ ama nke ọwụwa anyanwụ, e nwere oghere atọ dị nʼakụkụ ọbụla, oghere atọ ndị ahụ ha nʼotu. Ihu akụkụ aja ya niile nke chere ha ihu bụkwa otu nʼọtụtụ. 11Mgbe ahụ, ọ tụrụ obosara nke mbata ọnụ ụzọ ama ahụ, ọ dị mita ise na ụma atọ nʼobosara, na mita isii na ụma itoolu nʼogologo. 12Nʼihu oghere niile nke ụlọ ahụ e nwere mgbidi dị otu ọkara mita nʼịdị elu ya. Akụkụ anọ nke oghere ndị a ha otu. Ha ruru mita atọ mita atọ. 13Mgbe ahụ, ọ tụrụ obosara ọnụ ụzọ ama ahụ, site nʼelu ụlọ nke otu ime ụlọ ruo nʼelu ụlọ nke ime ụlọ chere ya ihu; obosara ya dị mita iri na atọ, site nʼotu oghere ruo nʼoghere nke chere ya ihu. 14Ọ tụrụ ogologo ogidi niile dị nʼakụkụ nʼime mgbidi ọnụ ụzọ ama ụlọ ahụ, chọpụta na ọ dị iri mita atọ na abụọ, ọ bụladị ruo nʼakụkụ mgbidi nke chere ihu nʼọnụ ụzọ ama ogige ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.