Native Bible

Ezekiel 40:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọnụ ụlọ ndị ahụ niile nwere oghereikuku dị warawara nʼakụkụ aja ụlọ ha, dịka mpụta ọnụ ụlọ ahụ nwekwara; oghereikuku ndị a dị gburugburu dị nʼime, nʼetiti ọnụ ụlọ ndị a. Nʼaja ụlọ ndị a niile, e nwere oyiyi nkwụ dị iche iche e sere nʼelu ha.

Ezekiel 40:16 in English

Ezekiel 40:16 · Berean Standard Bible

The gate chambers and their side pillars * had beveled windows all around the inside of the gateway. The porticos also had windows all around on the inside. Each side pillar was decorated with palm trees.

Context

14Ọ tụrụ ogologo ogidi niile dị nʼakụkụ nʼime mgbidi ọnụ ụzọ ama ụlọ ahụ, chọpụta na ọ dị iri mita atọ na abụọ, ọ bụladị ruo nʼakụkụ mgbidi nke chere ihu nʼọnụ ụzọ ama ogige ahụ. 15Site nʼihu ọnụ ụzọ ama mbata ahụ, ruo nʼebe ngwụcha nke ọnụ ụzọ dị na mpụta ọnụ ụlọ ya dị iri mita abụọ na asaa. 16Ọnụ ụlọ ndị ahụ niile nwere oghereikuku dị warawara nʼakụkụ aja ụlọ ha, dịka mpụta ọnụ ụlọ ahụ nwekwara; oghereikuku ndị a dị gburugburu dị nʼime, nʼetiti ọnụ ụlọ ndị a. Nʼaja ụlọ ndị a niile, e nwere oyiyi nkwụ dị iche iche e sere nʼelu ha. 17Ọ kpọbatara m nʼogige dị nʼezi. Nʼebe ahụ, ahụrụ m ụfọdụ ọnụụlọ dị na pevumentị e wunyere gburugburu ogige ahụ niile. Ha dị iri ọnụụlọ atọ dị nʼogologo pevumentị ahụ. 18Ebe nzọkwasị ụkwụ a gara ogologo ruo nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, ogologo ya na ọnụ ụzọ ama ahụ ha, nke a bụ pevumentị nke dịkarịrị ala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.