Native Bible

Ezekiel 27:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị, e ji ha na-enyeju mba dị iche iche afọ. E sitekwara nʼakụ gị dị ukwuu na ngwa ahịa gị mee ka ọtụtụ ndị eze nke ụwa bụrụ ọgaranya.

Ezekiel 27:33 in English

Ezekiel 27:33 · Berean Standard Bible

When your wares went out to sea, you satisfied many nations. You enriched the kings of the earth with your abundant wealth and merchandise.

Context

31Ha ga-akpụchapụ agịrị isi ha, yirikwa akwa mkpe, kwaa akwa nʼihi ịdị ilu nke mkpụrụobi ha. Ha ga-etikwa aka ha nʼobi. 32Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị, nke a bụ abụ akwa a ga-abụ banyere gị, “Onye ka e mere ka o dere duu ka e si mee obodo Taịa, nke osimiri gbara gburugburu?” 33Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị, e ji ha na-enyeju mba dị iche iche afọ. E sitekwara nʼakụ gị dị ukwuu na ngwa ahịa gị mee ka ọtụtụ ndị eze nke ụwa bụrụ ọgaranya. 34Ugbu a, mmiri e riela gị, ọ bụ nʼokpuru osimiri ka ị tọgbọ. Akụ gị niile na ihe ahịa gị niile, na ndị niile nọ nʼime gị esorola gị laa nʼiyi. 35Ihe ndị a niile ga-eju ndị bi nʼala ọnụ mmiri osimiri niile anya. Ndị eze ha niile tụkwara egwu nke ukwuu; ihu ha gbarụkwara agbarụ site nʼegwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.