Izikiel 27:33
Ezekiel 27:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị, e ji ha na-enyeju mba dị iche iche afọ. E sitekwara nʼakụ gị dị ukwuu na ngwa ahịa gị mee ka ọtụtụ ndị eze nke ụwa bụrụ ọgaranya.
Ezekiel 27:33 in English
Ezekiel 27:33 · Berean Standard Bible
When your wares went out to sea, you satisfied many nations. You enriched the kings of the earth with your abundant wealth and merchandise.
Context
31Ha ga-akpụchapụ agịrị isi ha,
yirikwa akwa mkpe,
kwaa akwa nʼihi ịdị ilu nke mkpụrụobi ha.
Ha ga-etikwa aka ha nʼobi. 32Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị,
nke a bụ abụ akwa a ga-abụ banyere gị,
“Onye ka e mere ka o dere duu ka e si mee obodo Taịa,
nke osimiri gbara gburugburu?” 33Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị,
e ji ha na-enyeju mba dị iche iche afọ.
E sitekwara nʼakụ gị dị ukwuu na ngwa ahịa gị
mee ka ọtụtụ ndị eze nke ụwa bụrụ ọgaranya. 34Ugbu a, mmiri e riela gị,
ọ bụ nʼokpuru osimiri ka ị tọgbọ.
Akụ gị niile na ihe ahịa gị niile,
na ndị niile nọ nʼime gị esorola gị laa nʼiyi. 35Ihe ndị a niile ga-eju ndị bi nʼala ọnụ mmiri
osimiri niile anya.
Ndị eze ha niile tụkwara egwu nke ukwuu;
ihu ha gbarụkwara agbarụ site nʼegwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.