Native Bible

Ezekiel 27:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị, nke a bụ abụ akwa a ga-abụ banyere gị, “Onye ka e mere ka o dere duu ka e si mee obodo Taịa, nke osimiri gbara gburugburu?”

Ezekiel 27:32 in English

Ezekiel 27:32 · Berean Standard Bible

As they wail and mourn over you, they will take up a lament for you: ‘Who was ever like Tyre, silenced in the middle of the sea?

Context

30Ha ga-eti mkpu akwa, ha ga-akwa akwa nke ukwuu, werekwa aja wụkwasị onwe ha nʼisi, na-atụrụkwa onwe ha na ntụ. 31Ha ga-akpụchapụ agịrị isi ha, yirikwa akwa mkpe, kwaa akwa nʼihi ịdị ilu nke mkpụrụobi ha. Ha ga-etikwa aka ha nʼobi. 32Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị, nke a bụ abụ akwa a ga-abụ banyere gị, “Onye ka e mere ka o dere duu ka e si mee obodo Taịa, nke osimiri gbara gburugburu?” 33Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị, e ji ha na-enyeju mba dị iche iche afọ. E sitekwara nʼakụ gị dị ukwuu na ngwa ahịa gị mee ka ọtụtụ ndị eze nke ụwa bụrụ ọgaranya. 34Ugbu a, mmiri e riela gị, ọ bụ nʼokpuru osimiri ka ị tọgbọ. Akụ gị niile na ihe ahịa gị niile, na ndị niile nọ nʼime gị esorola gị laa nʼiyi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.