Izikiel 27:32
Ezekiel 27:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị, nke a bụ abụ akwa a ga-abụ banyere gị, “Onye ka e mere ka o dere duu ka e si mee obodo Taịa, nke osimiri gbara gburugburu?”
Ezekiel 27:32 in English
Ezekiel 27:32 · Berean Standard Bible
As they wail and mourn over you, they will take up a lament for you: ‘Who was ever like Tyre, silenced in the middle of the sea?
Context
30Ha ga-eti mkpu akwa,
ha ga-akwa akwa nke ukwuu,
werekwa aja wụkwasị onwe ha nʼisi,
na-atụrụkwa onwe ha na ntụ. 31Ha ga-akpụchapụ agịrị isi ha,
yirikwa akwa mkpe,
kwaa akwa nʼihi ịdị ilu nke mkpụrụobi ha.
Ha ga-etikwa aka ha nʼobi. 32Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị,
nke a bụ abụ akwa a ga-abụ banyere gị,
“Onye ka e mere ka o dere duu ka e si mee obodo Taịa,
nke osimiri gbara gburugburu?” 33Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị,
e ji ha na-enyeju mba dị iche iche afọ.
E sitekwara nʼakụ gị dị ukwuu na ngwa ahịa gị
mee ka ọtụtụ ndị eze nke ụwa bụrụ ọgaranya. 34Ugbu a, mmiri e riela gị,
ọ bụ nʼokpuru osimiri ka ị tọgbọ.
Akụ gị niile na ihe ahịa gị niile,
na ndị niile nọ nʼime gị esorola gị laa nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.