Izikiel 27:31
Ezekiel 27:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-akpụchapụ agịrị isi ha, yirikwa akwa mkpe, kwaa akwa nʼihi ịdị ilu nke mkpụrụobi ha. Ha ga-etikwa aka ha nʼobi.
Ezekiel 27:31 in English
Ezekiel 27:31 · Berean Standard Bible
They will shave their heads for you and wrap themselves in sackcloth. They will weep over you with anguish of soul and bitter mourning.
Context
29Ndị niile na-anya ụgbọ mmiri,
na ndị ọka ụgbọ niile nke oke osimiri,
ga-esitekwa nʼụgbọ ha
rịdata guzo nʼelu ala. 30Ha ga-eti mkpu akwa,
ha ga-akwa akwa nke ukwuu,
werekwa aja wụkwasị onwe ha nʼisi,
na-atụrụkwa onwe ha na ntụ. 31Ha ga-akpụchapụ agịrị isi ha,
yirikwa akwa mkpe,
kwaa akwa nʼihi ịdị ilu nke mkpụrụobi ha.
Ha ga-etikwa aka ha nʼobi. 32Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị,
nke a bụ abụ akwa a ga-abụ banyere gị,
“Onye ka e mere ka o dere duu ka e si mee obodo Taịa,
nke osimiri gbara gburugburu?” 33Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị,
e ji ha na-enyeju mba dị iche iche afọ.
E sitekwara nʼakụ gị dị ukwuu na ngwa ahịa gị
mee ka ọtụtụ ndị eze nke ụwa bụrụ ọgaranya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.