Izikiel 27:34
Ezekiel 27:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, mmiri e riela gị, ọ bụ nʼokpuru osimiri ka ị tọgbọ. Akụ gị niile na ihe ahịa gị niile, na ndị niile nọ nʼime gị esorola gị laa nʼiyi.
Ezekiel 27:34 in English
Ezekiel 27:34 · Berean Standard Bible
Now you are shattered by the seas in the depths of the waters; your merchandise and the people among you have gone down with you.
Context
32Mgbe ha ga na-eti mkpu akwa na-erikwa uju nʼihi gị,
nke a bụ abụ akwa a ga-abụ banyere gị,
“Onye ka e mere ka o dere duu ka e si mee obodo Taịa,
nke osimiri gbara gburugburu?” 33Mgbe e si nʼime gị na-ebupụsị ihe ahịa gị,
e ji ha na-enyeju mba dị iche iche afọ.
E sitekwara nʼakụ gị dị ukwuu na ngwa ahịa gị
mee ka ọtụtụ ndị eze nke ụwa bụrụ ọgaranya. 34Ugbu a, mmiri e riela gị,
ọ bụ nʼokpuru osimiri ka ị tọgbọ.
Akụ gị niile na ihe ahịa gị niile,
na ndị niile nọ nʼime gị esorola gị laa nʼiyi. 35Ihe ndị a niile ga-eju ndị bi nʼala ọnụ mmiri
osimiri niile anya.
Ndị eze ha niile tụkwara egwu nke ukwuu;
ihu ha gbarụkwara agbarụ site nʼegwu. 36Ndị ahịa nke mba dị iche iche na-efufe isi ha,
nʼihi na ihe mere gị dị egwu.
Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ ”
27:10 Maọbụ, Lud
27:13 Maọbụ, Javan
27:14 Nke a bụ nʼọnọdụ ịkwụ ụgwọ, mgbe ụfọdụ ọ bụrụ na mmadụ ejighị ego, o nwere ike jiri ihe o nwere kwụọ ụgwọ ihe ọ zuru, site nʼụzọ ịgbanwere ihe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.