Native Bible

Ezekiel 21:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Mịghachinụ ya nʼọbọ ya. Nʼebe ahụ e kere unu nʼala nna nna unu ha, Aga m ekpe unu ikpe.

Ezekiel 21:30 in English

Ezekiel 21:30 · Berean Standard Bible

Return the sword to its sheath! In the place where you were created, in the land of your origin, I will judge you.

Context

28“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, buo amụma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru megide ndị Amọn nʼihi ịkwa emo ha: “ ‘Lee mma agha, lee mma agha, nke a mịpụtara maka oke ogbugbu. E hichaziela ya mee ka ọ dị nkọ iripịa, ka ọ na-egbu amụma dịka amụma egbe eluigwe. 29Nʼagbanyeghị ọhụ ụgha nke a na-ahụ banyere unu, na a jụtakwala ase ụgha banyere unu, a ga-etinye ya nʼolu ndị mmebi iwu ahụ a gaje igbu egbu, bụ ndị ụbọchị ha rurula, ndị oge ịta ahụhụ ha zukwara. 30“ ‘Mịghachinụ ya nʼọbọ ya. Nʼebe ahụ e kere unu nʼala nna nna unu ha, Aga m ekpe unu ikpe. 31Aga m awụkwasị unu ọnụma m, kukwasịkwa unu ikuku nke oke iwe m. Aga m ewere unu nyefee nʼaka ndị na-eme ihe ike, ndị bụ ọka na ịla mmadụ nʼiyi. 32Unu ga-aghọkwa mmanụ a na-awụnye nʼọkụ. A ga-awụsịkwa ọbara unu nʼala unu. Ọ dịkwaghị onye ga-echeta unu ọzọ, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.’ ” 21:7 Maọbụ, ike ga-agwụ mmụọ niile 21:12 Maọbụ, tie aka nʼapata ụkwụ gị 21:21 Maọbụ, nʼagbata ụzọ 21:23 Ya bụ, ajọ omume ha

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.