Izikiel 21:31
Ezekiel 21:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m awụkwasị unu ọnụma m, kukwasịkwa unu ikuku nke oke iwe m. Aga m ewere unu nyefee nʼaka ndị na-eme ihe ike, ndị bụ ọka na ịla mmadụ nʼiyi.
Ezekiel 21:31 in English
Ezekiel 21:31 · Berean Standard Bible
I will pour out My anger upon you; I will breathe the fire of My fury against you; I will hand you over to brutal men, skilled in destruction.
Context
29Nʼagbanyeghị ọhụ ụgha nke a na-ahụ banyere unu,
na a jụtakwala ase ụgha banyere unu,
a ga-etinye ya nʼolu
ndị mmebi iwu ahụ a gaje igbu egbu,
bụ ndị ụbọchị ha rurula,
ndị oge ịta ahụhụ ha zukwara. 30“ ‘Mịghachinụ ya nʼọbọ ya.
Nʼebe ahụ e kere unu
nʼala nna nna unu ha,
Aga m ekpe unu ikpe. 31Aga m awụkwasị unu ọnụma m,
kukwasịkwa unu ikuku nke oke iwe m.
Aga m ewere unu nyefee nʼaka ndị na-eme ihe ike,
ndị bụ ọka na ịla mmadụ nʼiyi. 32Unu ga-aghọkwa mmanụ a na-awụnye nʼọkụ.
A ga-awụsịkwa ọbara unu nʼala unu.
Ọ dịkwaghị onye ga-echeta unu ọzọ,
nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.’ ”
21:7 Maọbụ, ike ga-agwụ mmụọ niile
21:12 Maọbụ, tie aka nʼapata ụkwụ gị
21:21 Maọbụ, nʼagbata ụzọ
21:23 Ya bụ, ajọ omume ha
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.