Izikiel 21:15
Ezekiel 21:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka obi ha gbazee site nʼegwu, ka ndị na-ada ada hie nne, nʼihi na edoziela m mma agha ahụ nʼọnụ ụzọ ama ha niile maka oke ogbugbu. Lee, mma agha ahụ na-egbu amụma, etinyela ya nʼaka onye ga-egbu oke ogbugbu.
Ezekiel 21:15 in English
Ezekiel 21:15 · Berean Standard Bible
So that their hearts may melt and many may stumble, I have appointed at all their gates a sword for slaughter. Yes, it is ready to flash like lightning; it is drawn for slaughter.
Context
13“ ‘Ọnwụnwa aghaghị ịbịa. Ma gịnị ga-eme, ma ọ bụrụ na mkpara eze nke mma agha na-elelị anya, agaghị nʼihu na-adịgide? Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ 14“Nʼihi ya, buo amụma, nwa nke mmadụ.
Kụkọọ ọbụ aka gị abụọ,
ka mma agha gbuo ugboro abụọ
e, ọ bụladị ugboro atọ.
Ọ bụ mma agha e debere maka ogbugbu,
nke e debere maka oke ogbugbu
nke ga-abịachibido ha gburugburu. 15Ka obi ha gbazee site nʼegwu,
ka ndị na-ada ada hie nne,
nʼihi na edoziela m mma agha ahụ nʼọnụ ụzọ ama ha niile
maka oke ogbugbu.
Lee, mma agha ahụ na-egbu amụma,
etinyela ya nʼaka onye ga-egbu oke ogbugbu. 16Gị mma agha, ebe ọbụla ị chọrọ, ebe ọbụla i nwere ike, gbuo onye ọbụla,
ma ọ nọ gị nʼaka nri
ma ọ nọ gị nʼaka ekpe. 17Mụ onwe m ga-akụkọtakwa ọbụ aka m,
ime ka iwe m jụrụ.
Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.