Izikiel 21:13
Ezekiel 21:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ọnwụnwa aghaghị ịbịa. Ma gịnị ga-eme, ma ọ bụrụ na mkpara eze nke mma agha na-elelị anya, agaghị nʼihu na-adịgide? Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’
Ezekiel 21:13 in English
Ezekiel 21:13 · Berean Standard Bible
Surely testing will come! And what if even the scepter, which the sword despises, does not continue?’ declares the Lord GOD.
Context
11“ ‘E nyere iwu ka e hichazie mma agha ahụ,
ka e jidekwa ya nʼaka.
A mụọla ya, hichazie ya.
E doziela ya maka onye ahụ ga-eji ya laa ndụ nʼiyi. 12Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa ma kwasie akwa ike,
nʼihi na ọ bụ megide ndị m
ọ bụkwa megide ndịisi Izrel niile.
A na-atụnyere ha mma agha ga-egbu ha,
ha na ndị m.
Nʼihi ya, tie aka gị nʼobi gị.* 13“ ‘Ọnwụnwa aghaghị ịbịa. Ma gịnị ga-eme, ma ọ bụrụ na mkpara eze nke mma agha na-elelị anya, agaghị nʼihu na-adịgide? Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ 14“Nʼihi ya, buo amụma, nwa nke mmadụ.
Kụkọọ ọbụ aka gị abụọ,
ka mma agha gbuo ugboro abụọ
e, ọ bụladị ugboro atọ.
Ọ bụ mma agha e debere maka ogbugbu,
nke e debere maka oke ogbugbu
nke ga-abịachibido ha gburugburu. 15Ka obi ha gbazee site nʼegwu,
ka ndị na-ada ada hie nne,
nʼihi na edoziela m mma agha ahụ nʼọnụ ụzọ ama ha niile
maka oke ogbugbu.
Lee, mma agha ahụ na-egbu amụma,
etinyela ya nʼaka onye ga-egbu oke ogbugbu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.