Native Bible

Ezekiel 21:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa ma kwasie akwa ike, nʼihi na ọ bụ megide ndị m ọ bụkwa megide ndịisi Izrel niile. A na-atụnyere ha mma agha ga-egbu ha, ha na ndị m. Nʼihi ya, tie aka gị nʼobi gị.*

Ezekiel 21:12 in English

Ezekiel 21:12 · Berean Standard Bible

Cry out and wail, O son of man, for the sword is wielded against My people; it is against all the princes of Israel! They are tossed to the sword with My people; therefore strike your thigh.*

Context

10Amụọla ya nʼihi oke ogbugbu nke gaje ịdị, hichakwaa ya nke ọma ka ọ na-egbu dịka amụma. “ ‘Anyị ọ ga-aṅụrị ọṅụ na mkpara eze nwa m nwoke Juda? Mma agha na-elelị mkpara niile dị otu a anya. 11“ ‘E nyere iwu ka e hichazie mma agha ahụ, ka e jidekwa ya nʼaka. A mụọla ya, hichazie ya. E doziela ya maka onye ahụ ga-eji ya laa ndụ nʼiyi. 12Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa ma kwasie akwa ike, nʼihi na ọ bụ megide ndị m ọ bụkwa megide ndịisi Izrel niile. A na-atụnyere ha mma agha ga-egbu ha, ha na ndị m. Nʼihi ya, tie aka gị nʼobi gị.* 13“ ‘Ọnwụnwa aghaghị ịbịa. Ma gịnị ga-eme, ma ọ bụrụ na mkpara eze nke mma agha na-elelị anya, agaghị nʼihu na-adịgide? Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ 14“Nʼihi ya, buo amụma, nwa nke mmadụ. Kụkọọ ọbụ aka gị abụọ, ka mma agha gbuo ugboro abụọ e, ọ bụladị ugboro atọ. Ọ bụ mma agha e debere maka ogbugbu, nke e debere maka oke ogbugbu nke ga-abịachibido ha gburugburu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.