Izikiel 21:12
Ezekiel 21:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa ma kwasie akwa ike, nʼihi na ọ bụ megide ndị m ọ bụkwa megide ndịisi Izrel niile. A na-atụnyere ha mma agha ga-egbu ha, ha na ndị m. Nʼihi ya, tie aka gị nʼobi gị.*
Ezekiel 21:12 in English
Ezekiel 21:12 · Berean Standard Bible
Cry out and wail, O son of man, for the sword is wielded against My people; it is against all the princes of Israel! They are tossed to the sword with My people; therefore strike your thigh.*
Context
10Amụọla ya nʼihi oke ogbugbu nke gaje ịdị,
hichakwaa ya nke ọma ka ọ na-egbu dịka amụma.
“ ‘Anyị ọ ga-aṅụrị ọṅụ na mkpara eze nwa m nwoke Juda? Mma agha na-elelị mkpara niile dị otu a anya. 11“ ‘E nyere iwu ka e hichazie mma agha ahụ,
ka e jidekwa ya nʼaka.
A mụọla ya, hichazie ya.
E doziela ya maka onye ahụ ga-eji ya laa ndụ nʼiyi. 12Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa ma kwasie akwa ike,
nʼihi na ọ bụ megide ndị m
ọ bụkwa megide ndịisi Izrel niile.
A na-atụnyere ha mma agha ga-egbu ha,
ha na ndị m.
Nʼihi ya, tie aka gị nʼobi gị.* 13“ ‘Ọnwụnwa aghaghị ịbịa. Ma gịnị ga-eme, ma ọ bụrụ na mkpara eze nke mma agha na-elelị anya, agaghị nʼihu na-adịgide? Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ 14“Nʼihi ya, buo amụma, nwa nke mmadụ.
Kụkọọ ọbụ aka gị abụọ,
ka mma agha gbuo ugboro abụọ
e, ọ bụladị ugboro atọ.
Ọ bụ mma agha e debere maka ogbugbu,
nke e debere maka oke ogbugbu
nke ga-abịachibido ha gburugburu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.