Izikiel 21:16
Ezekiel 21:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gị mma agha, ebe ọbụla ị chọrọ, ebe ọbụla i nwere ike, gbuo onye ọbụla, ma ọ nọ gị nʼaka nri ma ọ nọ gị nʼaka ekpe.
Ezekiel 21:16 in English
Ezekiel 21:16 · Berean Standard Bible
Slash to the right; set your blade to the left— wherever your blade is directed.
Context
14“Nʼihi ya, buo amụma, nwa nke mmadụ.
Kụkọọ ọbụ aka gị abụọ,
ka mma agha gbuo ugboro abụọ
e, ọ bụladị ugboro atọ.
Ọ bụ mma agha e debere maka ogbugbu,
nke e debere maka oke ogbugbu
nke ga-abịachibido ha gburugburu. 15Ka obi ha gbazee site nʼegwu,
ka ndị na-ada ada hie nne,
nʼihi na edoziela m mma agha ahụ nʼọnụ ụzọ ama ha niile
maka oke ogbugbu.
Lee, mma agha ahụ na-egbu amụma,
etinyela ya nʼaka onye ga-egbu oke ogbugbu. 16Gị mma agha, ebe ọbụla ị chọrọ, ebe ọbụla i nwere ike, gbuo onye ọbụla,
ma ọ nọ gị nʼaka nri
ma ọ nọ gị nʼaka ekpe. 17Mụ onwe m ga-akụkọtakwa ọbụ aka m,
ime ka iwe m jụrụ.
Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.” 18Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.