Native Bible

Ezekiel 18:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ọ bụrụkwa na nwoke a nwere nwa nwoke nke hụrụ ihe ọjọọ ndị a niile nna ya na-eme, ma kpebie na ọ gakwaghị ebi ụdị ndụ ahụ.

Ezekiel 18:14 in English

Ezekiel 18:14 · Berean Standard Bible

Now suppose this son has a son who sees all the sins his father has committed, considers them, and does not do likewise:

Context

12Ọ na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa. Ọ na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ọ dịghị eweghachi ihe o naara na mbe. Ọ na-efe arụsị, na-emekwa ihe arụ ndị ọzọ dị iche iche. 13Ọ na-anara ndị ọ gbazinyere ego ọmụrụnwa na ụma. O kwesiri ka onye dị otu a dị ndụ? Ọ gaghị adị ndụ. Nʼihi na o meela ihe ndị a niile rụrụ arụ. A ga-egbu ya. Ọbara ya ga-adịkwa nʼisi ya. 14“Ọ bụrụkwa na nwoke a nwere nwa nwoke nke hụrụ ihe ọjọọ ndị a niile nna ya na-eme, ma kpebie na ọ gakwaghị ebi ụdị ndụ ahụ. 15“Ọ dịghị eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼelu ugwu maọbụ welie anya lee arụsị niile nke Izrel. Ọ dịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya. 16Ọ dịghị emegbu onye ọbụla, maọbụ anara ihe mbe nʼihi ego ọ gbazinyere mmadụ. Ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike, kama na ọ na-enye ndị agụ na-agụ ihe oriri ya, na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi;

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.