Izikiel 18:15
Ezekiel 18:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ dịghị eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼelu ugwu maọbụ welie anya lee arụsị niile nke Izrel. Ọ dịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya.
Ezekiel 18:15 in English
Ezekiel 18:15 · Berean Standard Bible
He does not eat at the mountain or look to the idols of the house of Israel. He does not defile his neighbor’s wife.
Context
13Ọ na-anara ndị ọ gbazinyere ego ọmụrụnwa na ụma.
O kwesiri ka onye dị otu a dị ndụ? Ọ gaghị adị ndụ. Nʼihi na o meela ihe ndị a niile rụrụ arụ. A ga-egbu ya. Ọbara ya ga-adịkwa nʼisi ya. 14“Ọ bụrụkwa na nwoke a nwere nwa nwoke nke hụrụ ihe ọjọọ ndị a niile nna ya na-eme, ma kpebie na ọ gakwaghị ebi ụdị ndụ ahụ. 15“Ọ dịghị eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼelu ugwu
maọbụ welie anya lee arụsị niile nke Izrel.
Ọ dịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya. 16Ọ dịghị emegbu onye ọbụla,
maọbụ anara ihe mbe nʼihi ego ọ gbazinyere mmadụ.
Ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike,
kama na ọ na-enye ndị agụ na-agụ ihe oriri ya,
na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi; 17ọ bụrụ na ọ dịghị etinye aka na mmehie ọbụla,
na ọ naghị anara ọmụrụnwa na ụma nʼaka ndị o binyere ego,
na ọ na-erubekwara iwu m niile isi, na-agbaso ụkpụrụ m niile.
Onye dị otu a agaghị anwụ nʼihi mmehie nke nna ya mere. Ọ ga-adị ndụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.