Izikiel 18:13
Ezekiel 18:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-anara ndị ọ gbazinyere ego ọmụrụnwa na ụma. O kwesiri ka onye dị otu a dị ndụ? Ọ gaghị adị ndụ. Nʼihi na o meela ihe ndị a niile rụrụ arụ. A ga-egbu ya. Ọbara ya ga-adịkwa nʼisi ya.
Ezekiel 18:13 in English
Ezekiel 18:13 · Berean Standard Bible
He engages in usury and takes excess interest. Will this son live? He will not! Since he has committed all these abominations, he will surely die; his blood will be on his own head.
Context
11ọ bụ ezie na nna ya emeghị ihe ndị a:
“Ma ọ na-eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼugwu,
na-emerụ nwunye onye agbataobi ya; 12Ọ na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa.
Ọ na-apụnara mmadụ ihe nʼike.
Ọ dịghị eweghachi ihe o naara na mbe.
Ọ na-efe arụsị,
na-emekwa ihe arụ ndị ọzọ dị iche iche. 13Ọ na-anara ndị ọ gbazinyere ego ọmụrụnwa na ụma.
O kwesiri ka onye dị otu a dị ndụ? Ọ gaghị adị ndụ. Nʼihi na o meela ihe ndị a niile rụrụ arụ. A ga-egbu ya. Ọbara ya ga-adịkwa nʼisi ya. 14“Ọ bụrụkwa na nwoke a nwere nwa nwoke nke hụrụ ihe ọjọọ ndị a niile nna ya na-eme, ma kpebie na ọ gakwaghị ebi ụdị ndụ ahụ. 15“Ọ dịghị eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼelu ugwu
maọbụ welie anya lee arụsị niile nke Izrel.
Ọ dịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.