Izikiel 18:12
Ezekiel 18:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa. Ọ na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Ọ dịghị eweghachi ihe o naara na mbe. Ọ na-efe arụsị, na-emekwa ihe arụ ndị ọzọ dị iche iche.
Ezekiel 18:12 in English
Ezekiel 18:12 · Berean Standard Bible
He oppresses the poor and needy; he commits robbery and does not restore a pledge. He lifts his eyes to idols; he commits abominations.
Context
10“Ọ bụrụ na o nwere nwa nwoke na-akpa ike, na-akwafu ọbara, na-emekwa ihe ndị ọzọ dị iche iche, 11ọ bụ ezie na nna ya emeghị ihe ndị a:
“Ma ọ na-eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼugwu,
na-emerụ nwunye onye agbataobi ya; 12Ọ na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa.
Ọ na-apụnara mmadụ ihe nʼike.
Ọ dịghị eweghachi ihe o naara na mbe.
Ọ na-efe arụsị,
na-emekwa ihe arụ ndị ọzọ dị iche iche. 13Ọ na-anara ndị ọ gbazinyere ego ọmụrụnwa na ụma.
O kwesiri ka onye dị otu a dị ndụ? Ọ gaghị adị ndụ. Nʼihi na o meela ihe ndị a niile rụrụ arụ. A ga-egbu ya. Ọbara ya ga-adịkwa nʼisi ya. 14“Ọ bụrụkwa na nwoke a nwere nwa nwoke nke hụrụ ihe ọjọọ ndị a niile nna ya na-eme, ma kpebie na ọ gakwaghị ebi ụdị ndụ ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.