Izikiel 18:10
Ezekiel 18:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ bụrụ na o nwere nwa nwoke na-akpa ike, na-akwafu ọbara, na-emekwa ihe ndị ọzọ dị iche iche,
Ezekiel 18:10 in English
Ezekiel 18:10 · Berean Standard Bible
Now suppose that man has a violent son, who sheds blood or does any of these things,
Context
8Ọ dịghị agbazinye mmadụ ego nara mụrụ nwa,
ọ dịghị ana ụma site nʼaka ha.
Ọ na-esite nʼihe ọjọọ sepụ aka ya,
na-ekpekwa ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ na ibe ya. 9Ọ na-edebezu iwu m niile,
na-agbaso ụkpụrụ m niile nʼikwesị ntụkwasị obi.
Onye ezi omume ka nwoke ahụ bụ;
ọ ghaghị ịdịkwa ndụ,
otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. 10“Ọ bụrụ na o nwere nwa nwoke na-akpa ike, na-akwafu ọbara, na-emekwa ihe ndị ọzọ dị iche iche, 11ọ bụ ezie na nna ya emeghị ihe ndị a:
“Ma ọ na-eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼugwu,
na-emerụ nwunye onye agbataobi ya; 12Ọ na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa.
Ọ na-apụnara mmadụ ihe nʼike.
Ọ dịghị eweghachi ihe o naara na mbe.
Ọ na-efe arụsị,
na-emekwa ihe arụ ndị ọzọ dị iche iche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.