Izikiel 18:9
Ezekiel 18:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-edebezu iwu m niile, na-agbaso ụkpụrụ m niile nʼikwesị ntụkwasị obi. Onye ezi omume ka nwoke ahụ bụ; ọ ghaghị ịdịkwa ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
Ezekiel 18:9 in English
Ezekiel 18:9 · Berean Standard Bible
He follows My statutes and faithfully keeps My ordinances. That man is righteous; surely he will live, declares the Lord GOD.
Context
7Onye na-adịghị emegbu ndị mmadụ,
kama ọ na-akwụghachi ụgwọ o ji, maọbụ na-enyeghachi ihe ọ naara dịka ihe mbe,
ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike,
kama ọ na-enye ndị agụụ na-agụ nri,
na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi. 8Ọ dịghị agbazinye mmadụ ego nara mụrụ nwa,
ọ dịghị ana ụma site nʼaka ha.
Ọ na-esite nʼihe ọjọọ sepụ aka ya,
na-ekpekwa ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ na ibe ya. 9Ọ na-edebezu iwu m niile,
na-agbaso ụkpụrụ m niile nʼikwesị ntụkwasị obi.
Onye ezi omume ka nwoke ahụ bụ;
ọ ghaghị ịdịkwa ndụ,
otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. 10“Ọ bụrụ na o nwere nwa nwoke na-akpa ike, na-akwafu ọbara, na-emekwa ihe ndị ọzọ dị iche iche, 11ọ bụ ezie na nna ya emeghị ihe ndị a:
“Ma ọ na-eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼugwu,
na-emerụ nwunye onye agbataobi ya;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.