Izikiel 18:16
Ezekiel 18:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị emegbu onye ọbụla, maọbụ anara ihe mbe nʼihi ego ọ gbazinyere mmadụ. Ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike, kama na ọ na-enye ndị agụ na-agụ ihe oriri ya, na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi;
Ezekiel 18:16 in English
Ezekiel 18:16 · Berean Standard Bible
He does not oppress another, or retain a pledge, or commit robbery. He gives his bread to the hungry and covers the naked with clothing.
Context
14“Ọ bụrụkwa na nwoke a nwere nwa nwoke nke hụrụ ihe ọjọọ ndị a niile nna ya na-eme, ma kpebie na ọ gakwaghị ebi ụdị ndụ ahụ. 15“Ọ dịghị eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼelu ugwu
maọbụ welie anya lee arụsị niile nke Izrel.
Ọ dịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya. 16Ọ dịghị emegbu onye ọbụla,
maọbụ anara ihe mbe nʼihi ego ọ gbazinyere mmadụ.
Ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike,
kama na ọ na-enye ndị agụ na-agụ ihe oriri ya,
na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi; 17ọ bụrụ na ọ dịghị etinye aka na mmehie ọbụla,
na ọ naghị anara ọmụrụnwa na ụma nʼaka ndị o binyere ego,
na ọ na-erubekwara iwu m niile isi, na-agbaso ụkpụrụ m niile.
Onye dị otu a agaghị anwụ nʼihi mmehie nke nna ya mere. Ọ ga-adị ndụ. 18Ma nna ya ga-anwụ nʼihi mmehie niile o mere, nʼihi na ọ bụ onye na-ewe ihe na-abụghị nke ya, onye na-apụnara ndị ọzọ ihe ha nwere nʼike. Ọ bụkwa onye na-eme ihe ọjọọ dị iche iche nʼetiti ndị ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.