Native Bible

Ezekiel 11:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma megide ha.”

Ezekiel 11:4 in English

Ezekiel 11:4 · Berean Standard Bible

Therefore prophesy against them; prophesy, O son of man!”

Context

2Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ndị a bụ ndị ikom na-agba izu ajọ ihe, na-enyekwa ndụmọdụ ọjọọ niile a na-enye nʼobodo a. 3Ha na-asị, ‘Oge a ga-ewuzi ụlọ ndị ahụ ọ dịghị nso? Obodo a bụ ite igwe, anyị onwe anyị bụkwa anụ dị nʼime ya.’ 4Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma megide ha.” 5Mgbe ahụ, Mmụọ nke Onyenwe anyị bịakwasịrị m sị m kwuo, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: otu a ka unu na-ekwukwa, unu ndị ndu ụlọ Izrel, ma amaara m ihe unu bụ nʼuche. 6Unu egbuola ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a, meekwa ka okporoụzọ ya jupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.