Native Bible

Ezekiel 11:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ndị a bụ ndị ikom na-agba izu ajọ ihe, na-enyekwa ndụmọdụ ọjọọ niile a na-enye nʼobodo a.

Ezekiel 11:2 in English

Ezekiel 11:2 · Berean Standard Bible

And the LORD said to me, “Son of man, these are the men who plot evil and give wicked counsel in this city.

Context

1Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m mee ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama ụlọ Onyenwe anyị, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Nʼebe ahụ, nʼoghere nke ọnụ ụzọ ama ahụ, ahụrụ m iri mmadụ abụọ na ise. Ahụkwara m nʼetiti ha, Jaazanaya nwa Azoa na Pelataya nwa Benaya, bụ ndịisi ndị Izrel. 2Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ndị a bụ ndị ikom na-agba izu ajọ ihe, na-enyekwa ndụmọdụ ọjọọ niile a na-enye nʼobodo a. 3Ha na-asị, ‘Oge a ga-ewuzi ụlọ ndị ahụ ọ dịghị nso? Obodo a bụ ite igwe, anyị onwe anyị bụkwa anụ dị nʼime ya.’ 4Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma megide ha.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.