Izikiel 11:3
Ezekiel 11:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-asị, ‘Oge a ga-ewuzi ụlọ ndị ahụ ọ dịghị nso? Obodo a bụ ite igwe, anyị onwe anyị bụkwa anụ dị nʼime ya.’
Ezekiel 11:3 in English
Ezekiel 11:3 · Berean Standard Bible
They are saying, ‘Is not the time near to build houses? The city is the cooking pot,* and we are the meat.’
Context
1Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m mee ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama ụlọ Onyenwe anyị, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Nʼebe ahụ, nʼoghere nke ọnụ ụzọ ama ahụ, ahụrụ m iri mmadụ abụọ na ise. Ahụkwara m nʼetiti ha, Jaazanaya nwa Azoa na Pelataya nwa Benaya, bụ ndịisi ndị Izrel. 2Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ndị a bụ ndị ikom na-agba izu ajọ ihe, na-enyekwa ndụmọdụ ọjọọ niile a na-enye nʼobodo a. 3Ha na-asị, ‘Oge a ga-ewuzi ụlọ ndị ahụ ọ dịghị nso? Obodo a bụ ite igwe, anyị onwe anyị bụkwa anụ dị nʼime ya.’ 4Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma megide ha.” 5Mgbe ahụ, Mmụọ nke Onyenwe anyị bịakwasịrị m sị m kwuo, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: otu a ka unu na-ekwukwa, unu ndị ndu ụlọ Izrel, ma amaara m ihe unu bụ nʼuche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.