Izikiel 11:5
Ezekiel 11:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Mmụọ nke Onyenwe anyị bịakwasịrị m sị m kwuo, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: otu a ka unu na-ekwukwa, unu ndị ndu ụlọ Izrel, ma amaara m ihe unu bụ nʼuche.
Ezekiel 11:5 in English
Ezekiel 11:5 · Berean Standard Bible
And the Spirit of the LORD fell upon me and told me to declare that this is what the LORD says: “That is what you are thinking, O house of Israel; and I know the thoughts that arise in your minds.
Context
3Ha na-asị, ‘Oge a ga-ewuzi ụlọ ndị ahụ ọ dịghị nso? Obodo a bụ ite igwe, anyị onwe anyị bụkwa anụ dị nʼime ya.’ 4Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma megide ha.” 5Mgbe ahụ, Mmụọ nke Onyenwe anyị bịakwasịrị m sị m kwuo, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: otu a ka unu na-ekwukwa, unu ndị ndu ụlọ Izrel, ma amaara m ihe unu bụ nʼuche. 6Unu egbuola ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a, meekwa ka okporoụzọ ya jupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ. 7“Nʼihi ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ji sị, ozu ndị ahụ niile tọgbọ nʼokporoụzọ obodo unu bụ anụ ndị ahụ unu gburu egbu, obodo a bụkwa ite. Ma aga m eme ka unu site nʼime ya pụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.