Ekiliziastis 4:3
Ecclesiastes 4:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ dị mma karịa ha abụọ bụ onye ahụ a na-amụbeghị, onye na-ahụbeghị ihe ọjọọ nke dị nʼokpuru anyanwụ.
Ecclesiastes 4:3 in English
Ecclesiastes 4:3 · Berean Standard Bible
But better than both is he who has not yet existed, who has not seen the evil that is done under the sun.
Context
1Ọzọ, ahụrụ m mmegbu na obi ilu niile dị nʼokpuru anyanwụ,
anya mmiri akwa ndị a na-emegbu emegbu,
ma ọ dịkwaghị ndị nkasiobi ha nwere,
ma ike dị nʼaka ndị mmegbu a,
ma ha enwekwaghị ndị nkasiobi. 2Nʼihi ya, ekwuru m, na ndị nwụrụ anwụ,
bụ ndị nwụrụ anwụ mgbe gara aga,
ka ndị dị ndụ mma,
bụ ndị nke dị ndụ ruo ugbu a. 3Ma ọ dị mma karịa ha abụọ
bụ onye ahụ a na-amụbeghị,
onye na-ahụbeghị ihe ọjọọ
nke dị nʼokpuru anyanwụ. 4Achọpụtakwara m na ihe mere ndị mmadụ ji na-adọgbu onwe ha nʼọrụ bụ nʼihi anya ụfụ ha nwere nʼebe ihe ndị agbataobi ha dị. Nke a bụ ihe efu, ịchụso ifufe. 5Onye nzuzu na-afanye aka abụọ nʼapata,
na-eri anụ ahụ onwe ya.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.