Native Bible

Ecclesiastes 4:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye nzuzu na-afanye aka abụọ nʼapata, na-eri anụ ahụ onwe ya.*

Ecclesiastes 4:5 in English

Ecclesiastes 4:5 · Berean Standard Bible

The fool folds his hands and consumes his own flesh.

Context

3Ma ọ dị mma karịa ha abụọ bụ onye ahụ a na-amụbeghị, onye na-ahụbeghị ihe ọjọọ nke dị nʼokpuru anyanwụ. 4Achọpụtakwara m na ihe mere ndị mmadụ ji na-adọgbu onwe ha nʼọrụ bụ nʼihi anya ụfụ ha nwere nʼebe ihe ndị agbataobi ha dị. Nke a bụ ihe efu, ịchụso ifufe. 5Onye nzuzu na-afanye aka abụọ nʼapata, na-eri anụ ahụ onwe ya.* 6Ọ ka mma inwe ihe ntakịrị na obi udo, karịa mmadụ inweju akụ site nʼịdọgbu onwe ya nʼọrụ, nke bụ naanị ịchụso ifufe. 7Ọ dịkwa ihe ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ bụ naanị ihe efu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.