Ekiliziastis 4:6
Ecclesiastes 4:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ka mma inwe ihe ntakịrị na obi udo, karịa mmadụ inweju akụ site nʼịdọgbu onwe ya nʼọrụ, nke bụ naanị ịchụso ifufe.
Ecclesiastes 4:6 in English
Ecclesiastes 4:6 · Berean Standard Bible
Better one handful with tranquility than two handfuls with toil and pursuit of the wind.
Context
4Achọpụtakwara m na ihe mere ndị mmadụ ji na-adọgbu onwe ha nʼọrụ bụ nʼihi anya ụfụ ha nwere nʼebe ihe ndị agbataobi ha dị. Nke a bụ ihe efu, ịchụso ifufe. 5Onye nzuzu na-afanye aka abụọ nʼapata,
na-eri anụ ahụ onwe ya.* 6Ọ ka mma inwe ihe ntakịrị na obi udo,
karịa mmadụ inweju akụ site nʼịdọgbu onwe ya nʼọrụ,
nke bụ naanị ịchụso ifufe. 7Ọ dịkwa ihe ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ bụ naanị ihe efu. 8Ọ dị otu nwoke nke naanị ya nọ,
o nweghị nwa, o nwekwaghị ụmụnne.
Mgbe niile, ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ,
ma nke a emeghị ka afọ ju ya nʼakụnụba o nwere.
Ọ jụrụ sị, “Ọ bụ nʼihi onye ka m ji adọgbu onwe m nʼọrụ,”
“nʼihi gịnị ka m ji anapụ onwe m ihe obi aṅụrị?”
Ihe nke a enweghị isi,
ihe efu na-eweta obi mgbawa ka ha bụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.