Ekiliziastis 4:1
Ecclesiastes 4:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọzọ, ahụrụ m mmegbu na obi ilu niile dị nʼokpuru anyanwụ, anya mmiri akwa ndị a na-emegbu emegbu, ma ọ dịkwaghị ndị nkasiobi ha nwere, ma ike dị nʼaka ndị mmegbu a, ma ha enwekwaghị ndị nkasiobi.
Ecclesiastes 4:1 in English
Ecclesiastes 4:1 · Berean Standard Bible
Again I looked, and I considered all the oppression taking place under the sun. I saw the tears of the oppressed, and they had no comforter; the power lay in the hands of their oppressors, and there was no comforter.
Context
1Ọzọ, ahụrụ m mmegbu na obi ilu niile dị nʼokpuru anyanwụ,
anya mmiri akwa ndị a na-emegbu emegbu,
ma ọ dịkwaghị ndị nkasiobi ha nwere,
ma ike dị nʼaka ndị mmegbu a,
ma ha enwekwaghị ndị nkasiobi. 2Nʼihi ya, ekwuru m, na ndị nwụrụ anwụ,
bụ ndị nwụrụ anwụ mgbe gara aga,
ka ndị dị ndụ mma,
bụ ndị nke dị ndụ ruo ugbu a. 3Ma ọ dị mma karịa ha abụọ
bụ onye ahụ a na-amụbeghị,
onye na-ahụbeghị ihe ọjọọ
nke dị nʼokpuru anyanwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.