Ekiliziastis 3:10
Ecclesiastes 3:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụla m ibu arọ nke Chineke bokwasịrị ndị mmadụ e kere eke.
Ecclesiastes 3:10 in English
Ecclesiastes 3:10 · Berean Standard Bible
I have seen the burden that God has laid upon the sons of men to occupy them.
Context
8oge ịhụnanya na oge ịkpọ asị,
oge ibu agha, na oge ime udo. 9Gịnị bụ nnọọ ihe mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile nke nʼọrụ niile ọ na-arụ? 10Ahụla m ibu arọ nke Chineke bokwasịrị ndị mmadụ e kere eke. 11O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ. 12Nʼihi ya, ekpebiri m na ihe dịịrị mmadụ ịchọ bụ obi ụtọ na inwe aṅụrị na ndụ ya niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.